Jeremiah 30

Nlọta ụmụ Izrel

1Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya. 2“Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ. 3Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”

4Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda. 5“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu,
nke oke egwu, ọ bụghị udo.
6Jụọnụ ajụjụ, ma hụ,
nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ?
Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike
ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme,
ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?
7Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ.
O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya.
Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb,
ma a ga-anapụta ya site na ya.

8“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’
‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu,
tibisikwaa agbụ niile e kere ha.
Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha,
na Devid eze ha,
onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.

10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
Atụkwala ụjọ
Ya bụ, adakwala mba
gị Izrel,’
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya,
zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya.
Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe.
Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.
11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi,
bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha,
agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam.
Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,
Dịka o ziri ezi nʼikpe

ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’
12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara,

“ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta,
mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.
13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,
o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa.
Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.
14Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;
ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha.
E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe;
ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ,
nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu,
mmehie gị dịkwa ọtụtụ.
15Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?
Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,
na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.

16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;
ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ.
Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike.
Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.
17Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;
aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ.
Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’
18“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu
Ya bụ, ebe obibi
ya;
aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya.
A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;
Ụfọdụ akwụkwọ na-asị nʼelu ugwu ya

ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.
19Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele,
na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ.
Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ,
ha agaghị adịkwa ole na ole.
Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ,
ndị a na-agaghị eledakwa anya.
20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ,
nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m.
Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.
21Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha;
onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta.
Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso,
nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam,
maka ịbịaru m nso?’
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
22‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m,
mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ”

23Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya
mee ka oke ifufe ya fee.
Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu
dịka ifufe na-efesi ike.
24Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị
tutu ruo mgbe o mezuru
ihe ndị o bu nʼobi.
Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa
unu ga-aghọta ihe ndị a.
Copyright information for IboBIU